Jọn 12

Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto.

John 12:23 (UKJV) And Jesus answered them, saying, The hour has come, that the Son of man should be glorified.

21Ha bịakwutere Filip onye si Betsaida dị na Galili, gwa ya sị, “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jisọs.”

22Filip pụrụ gaa gwa Andru, ya na Andru sooro gaa gwa Jisọs.

23Jisọs zara sị, “Oge awa ahụ eruola mgbe a ga-enye Nwa nke Mmadụ otuto.

24Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ bụrụ na mkpụrụ ọka wiiti adaghị nʼala nwụọ, ọ ga-anọ naanị ya. Ma ọ bụrụ na ọ nwụọ, ọ ga-amị ọtụtụ mkpụrụ.

25Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.