29Igwe ndị mmadụ guzo nʼebe ahụ, ndị nụrụ ya na-ekwu, “Ọ bụ egbe eluigwe gbara.” Ndị ọzọ na-asị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.”
30Jisọs zara ma sị, “Olu a abịaghị nʼihi m kama ọ bịara nʼihi unu.
31Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a.
32Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.”
33O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ.