Jọn 12

O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ.

John 12:33 (UKJV) This he said, signifying what death he should die.

31Ugbu a bụ oge a ga-ekpe ụwa a ikpe. Ugbu a ka a ga-achụpụ onye ahụ na-achị ụwa a.

32Ma mụ onwe m, mgbe e si nʼụwa welie m elu, aga m adọta mmadụ niile nye onwe m.”

33O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ nke ọ gaje ịnwụ.

34Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?”

35Jisọs sịrị ha, “Ìhè ga-enwuru unu naanị nwa oge nta. Jegharịanụ nʼìhè a, ugbu a unu nwere ya, tupu ọchịchịrị abịakwasị unu. Onye na-ejegharị nʼọchịchịrị amaghị ebe ọ na-aga.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.