43Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke.
44Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m.
45Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m.
46Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị.
47“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.