Jọn 12

Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị.

John 12:46 (UKJV) I am come a light into the world, that whosoever believes on me should not abide in darkness.

44Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m.

45Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m.

46Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị.

47“Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.

48Onye ọbụla jụrụ m ma jụkwa okwu m, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Okwu niile m kwuru ga-ama ya ikpe nʼụbọchị ikpeazụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.