17Nwaagbọghọ ahụ sịrị Pita, “Ọ bụ na ị bụghị otu nʼime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” Pita sịrị, “Mba! Abụghị m.”
18Ndị ohu na ndị nche kwanyere ọkụ nʼihi na oyi na-atụ. Ha guzoro nʼebe ahụ na-anya ọkụ. Pita soro ha guzo na-anyakwa ọkụ.
19Nʼoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ jụrụ Jisọs banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ozizi ya.
20Jisọs zara ya, “Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo.
21Gịnị mere i ji ajụ m? Jụọ ndị niile gere m ntị! Ha makwaara ihe niile m kwuru.”