11Jisọs zara ya, “Ị garaghị enwe ike ọbụla nʼebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nʼelu rute gị aka. Nke a mere mmehie onye duru m nye nʼaka gị ji karịa.”
12Site na mgbe ahụ Pailet chọsịrị ike ịhapụ ya. Ma ndị Juu tisiri mkpu ike sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, ị bụkwaghị enyi Siza. Nʼihi na onye ọbụla na-eme onwe ya eze na-elelị Siza.”
13Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nʼezi, nọdụkwa ala nʼoche ikpe ya dị nʼebe a na-akpọ Pevumentị (maọbụ Gabata nʼasụsụ Hibru).
14Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!”
15Ma ha tiri mkpu, “Kpọpụ ya, Kpọpụ ya! Kpọgide ya nʼobe.” Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nʼobe?” Ma ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza.”