1Mgbe ahụ, Pailet kpụụrụ Jisọs, a pịa ya ihe.
2Ndị agha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi, yinyekwa ya uwe mwụda na-acha odo odo.
3Ha bịakwutere ya ọtụtụ mgbe na-asị, “Ekele, gị Eze ndị Juu!” Ha na-amakwa ya ụra nʼihu.
4Pailet pụkwara nʼezi ọzọ sị ha, “Lee, ana m akpọpụtara unu ya, ka unu mara na achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.”