20Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin.
21Ndịisi nchụaja nke ndị Juu gwara Pailet sị, “Edela na ọ bụ Eze ndị Juu, kama dee na nwoke a sịrị, abụ m eze ndị Juu.”
22Ma Pailet zara, “Ihe m dere, edeela m ya.”
23Mgbe ndị agha kpọgidechara Jisọs nʼobe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Onye ọbụla nʼime ha nwetara otu ụzọ. Ha chịrị uwe mwụda ya nke a na-adụghị adụ, kama a kpara ya akpa site nʼelu ya ruo nʼala ya.
24Ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya.” Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwụda m.” Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere.