22Ma Pailet zara, “Ihe m dere, edeela m ya.”
23Mgbe ndị agha kpọgidechara Jisọs nʼobe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Onye ọbụla nʼime ha nwetara otu ụzọ. Ha chịrị uwe mwụda ya nke a na-adụghị adụ, kama a kpara ya akpa site nʼelu ya ruo nʼala ya.
24Ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya.” Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwụda m.” Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere.
25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs.
26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.”