24Ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya.” Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwụda m.” Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere.
25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs.
26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.”
27Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya.
28Nʼikpeazụ, mgbe Jisọs matara na ihe niile emezuola. Ma iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ọ sịrị, “Akpịrị na-akpọ m nkụ.”