34Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara.
35Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.
36Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.”
37E dekwara nʼebe ọzọ nʼakwụkwọ sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mapuru ahụ anya.”
38Mgbe ihe ndị a gasịrị, otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere Arimatia, onye na-eso ụzọ Jisọs na nzuzo, nʼihi egwu ndị Juu, jekwuuru Pailet rịọ ka o nye ya ikike iburu ahụ Jisọs, Pailet kwere, ya mere ọ bịara buru ahụ ya.