Jọn 19

Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara.

John 19:34 (UKJV) But one of the soldiers with a spear pierced his side, and forthwith came there out blood and water.

32Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na ya.

33Ma mgbe ha bịaruru nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọlarị. Nʼihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya.

34Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara.

35Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.

36Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.