3Mgbe mmanya ha gwụrụ, nne Jisọs sịrị ya, “Ha enweghị mmanya.”
4Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị gbasara mụ na gị na nke a? Oge awa m erubeghị.”
5Nne ya gwara ndị na-eje ozi, “Ihe ọbụla ọ gwara unu, meenụ ya.”
6A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ.
7Jisọs gwara ha, “Gbajuonụ ite ndị a mmiri.” Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri.