5Nne ya gwara ndị na-eje ozi, “Ihe ọbụla ọ gwara unu, meenụ ya.”
6A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ.
7Jisọs gwara ha, “Gbajuonụ ite ndị a mmiri.” Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri.
8Mgbe ahụ, ọ gwara ha, “Ugbu a, gbapụtanụ ụfọdụ bugara onyeisi oche.” Ha mekwara nke a.
9Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ. Ọ mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche