Jọn 20

Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ.

John 20:1 (UKJV) The first day of the week comes Mary Magdalene early, when it was yet dark, unto the tomb, and sees the stone taken away from the tomb.

1Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ.

2O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!”

3Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.