14Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs.
15Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.”
16Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)”
17Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ ”
18Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.