12hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs.
13Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.”
14Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs.
15Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.”
16Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)”