Jọn 20

Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ.

John 20:22 (UKJV) And when he had said this, he breathed on them, and says unto them, Receive all of you the Holy Spirit:

20Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị.

21Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.”

22Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ.

23Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.”

24Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.