9Nikọdimọs zara sị ya, “Olee otu ihe ndị a ga-esi mee?”
10Jisọs zara sị ya, “Ị bụ onye ozizi ndị Izrel, ma ị ghọtaghị ihe ndị a?
11Nʼezie, nʼezie agwa m unu. Anyị na-ekwu banyere ihe anyị maara, na-akọwapụtakwa ihe anyị hụrụ, ma unu onwe unu adịghị anabata akaebe anyị.
12Ekwuola m banyere ihe dị nʼụwa ma unu ekweghị ya, oleekwanụ otu unu ga-esi kwere, ma ọ bụrụ na mụ agwa unu banyere ihe ndị dị nʼeluigwe?
13O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata.