13O nwebeghị onye ọbụla rigooro nʼeluigwe ewezuga Nwa nke Mmadụ bụ onye siri nʼeluigwe rịdata.
14Dị ka Mosis weliri agwọ elu nʼime ọzara, otu a ka a ga-ewelikwa Nwa nke Mmadụ elu.
15Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.”
16Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.
17Nʼihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya nʼụwa ka o maa ụwa ikpe, kama ka e site nʼaka ya zọpụta ụwa.