1O nwere otu nwoke onyeisi ndị Juu nke so nʼotu ndị Farisii aha ya bụ Nikọdimọs.
2Ọ bịakwutere ya nʼabalị sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ onye ozizi sitere na Chineke, nʼihi na o nweghị onye ọbụla pụrụ ịrụ ọrụ ebube dị otu a ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”
3Jisọs zara sị ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.”
4Nikọdimọs sịrị ya, “Olee otu a ga-esi mụgharịa mmadụ mgbe o mere okenye? Ọ ga-aba nʼafọ nne ya nke ugboro abụọ?”