21Ma ndị na-ebi ndụ nʼeziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e nwee ike hụta ya nke ọma, na ihe niile ha na-eme sitere na ike Chineke.
22Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime obodo Judịa, ebe ọ nọtụrụ nwa oge, meekwa baptizim.
23Nʼotu aka ahụ, Jọn nọkwa nʼọnụ mmiri Enọn dị nso na Salim na-eme baptizim nʼihi na mmiri buru ibu nʼebe ahụ, ndị mmadụ gakwara nʼihu na-abịakwute ya, ọ na-emekwa ha baptizim.
24E tinyebeghị Jọn nʼụlọ mkpọrọ mgbe ahụ.
25Nʼoge a, ịrụrịta ụka malitere nʼetiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere mmemme ịdị ọcha.