25Nʼoge a, ịrụrịta ụka malitere nʼetiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere mmemme ịdị ọcha.
26Ha bịakwutere Jọn sị ya, “Onye ozizi, onye ahụ ị gbara ama banyere ya nọ nʼofe Jọdan na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwukwara ya.”
27Jọn zaghachiri sị, “Ihe mmadụ nwere ike ịnata bụ naanị ihe ahụ e nyere ya site nʼeluigwe.
28Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, na abụghị m Kraịst ahụ, kama e zitere m ka m buru ụzọ bịa.
29Nwanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nke di ya. Enyi onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-eche ma na-egekwa ntị ịnụ olu ya, ọṅụ na-ejupụtakwa ya obi mgbe ọ nụrụ olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ. Ya mere, ọṅụ m e zuola oke ugbu a.