18I nweela di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe kwuru bụ nnọọ eziokwu.”
19Nwanyị ahụ sịrị ya “Nna anyị ukwu, ahụrụ m na ị bụ onye amụma.
20Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.”
21Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem.
22Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu.