23Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya.
24Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.”
25Nwanyị ahụ sịrị ya, “Amaara m na Mezaya” (onye a na-akpọ Kraịst) “na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwaziri anyị ihe niile.”
26Jisọs sịrị ya, “Mụ, onye na-agwa gị okwu, abụ m ya.”
27Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” ma ọ bụkwanụ, “Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?”