1Ugbu a, Jisọs matara na ndị Farisii anụla na ọ na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya na-emekwa baptizim karịa Jọn.
2Ma ọ bụkwaghị Jisọs na onwe ya na-eme baptizim kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim.
3Ọ hapụrụ Judịa laghachi azụ na Galili.
4Ma ọ ga-esite nʼetiti Sameria gafee.
5Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke.