Jọn 4

E zigara m unu ka unu gaa ghọta ihe unu na-arụghị ọrụ maka ya. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu ewe uru dị nʼọrụ ha.”

John 4:38 (UKJV) I sent you to reap that whereon all of you bestowed no labour: other men laboured, and all of you are entered into their labours.

36Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ.

37Ya mere okwu ahụ nke na-asị, ‘Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-aghọkwa ya bụ eziokwu.’

38E zigara m unu ka unu gaa ghọta ihe unu na-arụghị ọrụ maka ya. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu ewe uru dị nʼọrụ ha.”

39Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.”

40Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.