39Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.”
40Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ.
41Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya.
42Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.”
43Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili.