41Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya.
42Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.”
43Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili.
44(Jisọs nʼonwe ya ekwuola na onye amụma anaghị enwe ugwu nʼobodo ya.)
45Mgbe ọ bịaruru Galili, ndị Galili nabatara ya ebe ha onwe ha gara mmemme na Jerusalem, ma hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nʼoge mmemme ahụ.