Jọn 4

Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.”

John 4:48 (UKJV) Then said Jesus unto him, Except all of you see signs and wonders, all of you will not believe.

46Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm.

47Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ.

48Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.”

49Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.”

50Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.