Jọn 4

Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.”

John 4:49 (UKJV) The nobleman says unto him, Sir, come down before my child die.

47Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ.

48Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.”

49Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.”

50Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa.

51Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.