Jọn 5

Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise.

John 5:2 (UKJV) Now there is at Jerusalem by the sheep market a pool, which is called in the Hebrew tongue Bethesda, having five porches.

1Mgbe nke a gasịrị, otu mmemme ndị Juu ruru, Jisọs agaa Jerusalem.

2Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise.

3Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị.

4Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.