29ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe.
30Enweghị m ike ime ihe ọbụla nʼonwe m, ikpe m na-ekpe bụ naanị dị ka m nụrụ, ikpe m bụkwa nke ziri ezi, nʼihi na anaghị m eme ihe ga-amasị m, kama ọ bụ ihe ga-amasị onye ahụ zitere m.
31“Ọ bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, ama m abụghị eziokwu.
32Enwere m onye ọzọ na-agbara m ama, amatakwara m na ama ya banyere m bụ eziokwu.
33“Unu zigaara Jọn ndị ozi, ọ gbakwaala ama maka eziokwu ahụ.