31“Ọ bụrụ na m na-agba ama banyere onwe m, ama m abụghị eziokwu.
32Enwere m onye ọzọ na-agbara m ama, amatakwara m na ama ya banyere m bụ eziokwu.
33“Unu zigaara Jọn ndị ozi, ọ gbakwaala ama maka eziokwu ahụ.
34Ọ bụghị na m na-anabata ama nke mmadụ, kama a na m ekwu ya ka enwe ike ịzọpụta unu.
35Ọ bụ oriọna nke na-enwu na-amụkekwa, unu họrọkwara ịṅụrị ọṅụ nʼìhè ya nʼoge nta.