4Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya.
5Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ.
6Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, ọ jụrụ ya sị, “Ị chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?”
7Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.”
8Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.”