5Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ.
6Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, ọ jụrụ ya sị, “Ị chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?”
7Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.”
8Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.”
9Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị. Ihe a mere nʼụbọchị izuike.