7Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.”
8Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.”
9Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị. Ihe a mere nʼụbọchị izuike.
10Ma ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, “Taa bụ ụbọchị izuike, o megidere iwu na ị ga-ebu ute gị.”
11Ma ọ zaghachiri ha, “Nwoke ahụ mere ka ahụ dị m mma sịrị m, ‘Chilie ute gị laa.’ ”