Jọn 6

Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise.

John 6:10 (UKJV) And Jesus said, Make the men sit down. Now there was much grass in the place. So the men sat down, in number about five thousand.

8Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara,

9“Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?”

10Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise.

11Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ.

12Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.