Jọn 6

Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”

John 6:14 (UKJV) Then those men, when they had seen the miracle that Jesus did, said, This is truthfully that prophet that should come into the world.

12Mgbe ha niile rijuchara afọ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Tụtụkọtanụ iberibe niile fọdụrụ, ka ihe ọbụla hapụ ịla nʼiyi.”

13Ya mere, ha tụtụkọtara ha, kpojuo nkata iri na abụọ, bụ iberibe si nʼogbe achịcha balị ise nke ndị ahụ rifọrọ.

14Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”

15Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.

16Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.