Jọn 6

Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri,

John 6:16 (UKJV) And when even was now come, his disciples went down unto the sea,

14Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ ihe ịrịbama ahụ, o mere ha bidoro na-asị, “Nʼeziokwu, onye a bụ onye amụma ahụ nke ga-abịa nʼime ụwa.”

15Mgbe Jisọs matara na ha chọrọ ịbịa dọkpụrụ ya nʼike chie ya eze, ọ hapụrụ ha ga nʼugwu naanị ya, nʼonwe ya.

16Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri,

17ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha.

18Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.