Jọn 6

Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ.

John 6:26 (UKJV) Jesus answered them and said, Verily, verily, I say unto you, All of you seek me, not because all of you saw the miracles, but because all of you did eat of the loaves, and were filled.

24Ma mgbe igwe mmadụ ahụ ghọtara na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya anọghị nʼebe ahụ, ha banyere nʼụgbọ mmiri nta ndị ahụ kwọfee gawa Kapanọm ịchọ Jisọs.

25Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?”

26Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ.

27Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.”

28Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.