Jọn 6

Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.”

John 6:27 (UKJV) Labour not for the food which perishes, but for that food which endures unto everlasting life, which the Son of man shall give unto you: for him has God the Father sealed.

25Mgbe ha hụrụ ya nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ, ha sịrị ya, “Onye ozizi, olee mgbe i jiri bịa nʼebe a?”

26Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ihe unu ji na-achọ m abụghị nʼihi na unu hụrụ ihe ịrịbama m mere, kama na unu riri achịcha rijuokwa afọ.

27Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.”

28Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?”

29Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.