Jọn 6

Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.”

John 6:29 (UKJV) Jesus answered and said unto them, This is the work of God, that all of you believe on him whom he has sent.

27Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.”

28Mgbe ahụ, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?”

29Jisọs zara sị ha, “Ọrụ Chineke bụ nke a, ikwere nʼonye ahụ o zitere.”

30Ya mere ha sịrị ya, “Olee ihe ịrịbama ị ga-egosi anyị nke anyị ga-ahụ ma kwere na gị? Kedụ ọrụ ị ga-arụ?

31Nna nna anyị ha riri mánà nʼọzara; dị ka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘O sitere nʼeluigwe nye ha achịcha ka ha rie.’”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.