Jọn 6

Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.”

John 6:34 (UKJV) Then said they unto him, Lord, evermore give us this bread.

32Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụghị Mosis nyere unu achịcha ahụ site nʼeluigwe, kama ọ bụ Nna m na-enye unu ezi achịcha ahụ site nʼeluigwe.

33Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.”

34Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.”

35Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.

36Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.