33Nʼihi na achịcha Chineke bụ nke ahụ si nʼeluigwe rịdata, na-enyekwa ụwa ndụ.”
34Ha sịrị ya, “Nna anyị ukwu, nye anyị ụdị achịcha a site ugbu a gawa.”
35Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.
36Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa.
37Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya.