35Jisọs sịrị ha, “Abụ m achịcha ahụ na-enye ndụ. Onye ọbụla na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya. Onye ọbụla kwa kweere na m, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ.
36Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa.
37Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya.
38Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m.
39Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ.