36Ma agwa m unu, unu ahụla m ma unu ekweghịkwa.
37Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya.
38Nʼihi na esi m nʼeluigwe rịdata nʼụwa ime uche onye ahụ zitere m, ọ bụghị ime uche nke m.
39Nke a bụkwa uche onye ahụ zitere m, na o nweghị onye ọbụla o nyere m ga-efunarị m, kama m ga-eme ka ha site nʼọnwụ bilie nʼụbọchị ikpeazụ.
40Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.”