44O nweghị onye nwere ike ịbịakwute m ma ọ bụghị na Nna ahụ zitere m kpọtara ya, aga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ.
45E dere ya nʼakwụkwọ ndị amụma, ‘Ha niile ga-abụ ndị Chineke ga-akụziri ihe.’ Onye ọbụla nke gere Nna ahụ ntị ma mụtakwa ihe site na ya na-abịakwute m.
46O nweghị onye ọbụla hụrụla Nna ahụ karịakwa onye ahụ sitere na Chineke, naanị ya hụrụla Nna ahụ.
47Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi.
48Abụ m achịcha nke ndụ.