47Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi.
48Abụ m achịcha nke ndụ.
49Nna nna unu ha riri mánà ahụ nʼime ọzara ma mecha nwụọ.
50Ma nke a bụ achịcha ahụ nke si nʼeluigwe bịa, nke mmadụ pụrụ iri ma ghara ịnwụ anwụ.
51Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.”